Mkpughe 2

“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smyrna, sị ya: Ihe ndị a bụ okwu ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe niile. Onye nwụrụ anwụ ma dịkwa ndụ ọzọ.

Revelation 2:8 (UKJV) And unto the angel of the church in Smyrna write; These things says the first and the last, which was dead, and is alive;

6Ọ bụladị otu a, o nwere ihe ụfọdụ dị mma banyere gị. Ị kpọrọ ọrụ ọjọọ nke ndị Nikolaitan asị, dịka mụ onwe m si kpọọ ya asị.

7Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye ike iri mkpụrụ sitere nʼosisi ndụ ahụ nke dị na paradaịs nke Chineke.

8“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smyrna, sị ya: Ihe ndị a bụ okwu ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe niile. Onye nwụrụ anwụ ma dịkwa ndụ ọzọ.

9Amaara m mkpagbu gị niile na ịda ogbenye gị. Ma nʼezie, ị bụ ọgaranya. Amaara m ihe banyere nkwutọ niile ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị Juu na-ekwutọ gị, ma ha abụghị ndị Juu, nʼezie ha bụ ụlọ nzukọ ekwensu.

10Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.