1“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Sardis, sị ya: Ndị a bụ okwu onye ahụ nwere mmụọ asaa nke Chineke na kpakpando asaa. Amaara m ọrụ gị niile, ị nwere aha dịka onye dị ndụ ma ị bụ onye nwụrụ anwụ.
2Ugbu a, sị nʼụra bilite. Mee ka ihe ntakịrị ahụ fọdụrụ na-achọ ịnwụ anwụ dịrị ike. Nʼihi na ọ dịghị ọrụ gị m hụrụ dị ka ihe zuruoke nʼanya Chineke m.
3Ya mere, cheta ihe ndị ahụ ị natara na nke ị nụrụ; rube isi nye ya, chegharịakwa. Ma ọ bụrụ na i tetaghị, aga m abịakwute gị dị ka onye ohi, ị gaghị amatakwa oge m ji bịakwute gị.
4Otu ọ dị, i nwere ụfọdụ mmadụ na Sardis ndị na-emerụbeghị uwe ha. Ha ga-eyiri uwe ọcha ma soro m jee ije nʼihi na ha bụ ndị kwesiri ekwesi.