8Nke ọbụla nʼime ihe anọ ndị a dị ndụ nwere nku isii. Anya jupụtara nʼahụ ha niile na nʼime ha, ọ bụladị nʼokpuru nku ha. Ehihie na abalị niile, ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị, “ ‘Nsọ, Nsọ, Nsọ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile dị,’ bụ onye ahụ dịkwaarị, onye ahụ na-adị, na onye ahụ na-aga ịbịa.”
9Mgbe ọbụla anụ ndị ahụ dị ndụ na-enye onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi otuto na nsọpụrụ na ekele,
10iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nʼala nʼihu onye ahụ nọ nʼocheeze na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ha niile nʼotu nʼotu na-atụda okpueze ha nʼihu ya na-abụ abụ na-asị,
11“Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, kwesiri ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike. Nʼihi na gị onwe gị kere ihe niile, ọ bụkwa site nʼọchịchọ gị ka e ji kee ha, ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”