1Mgbe ahụ, ahụrụ m akwụkwọ e dere ihe ihu na azụ, nke a fụkọrọ afụkọ, kakwasịkwa ya akara asaa, ka ọ dị nʼaka nri onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ.
2Ahụkwara m otu mmụọ ozi dị ukwuu, ka ọ na-ekwusa okwu nʼoke olu na-asị, “Ọ bụ onye kwesiri ịnyakapụ akara ndị a ma saghee akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ?”
3Ma ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ilenye ya anya a hụrụ nʼeluigwe, maọbụ nʼụwa, maọbụ nʼokpuru ụwa.
4Akwara m akwa nʼobi ilu nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla a hụrụ tozuru oke ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ileba anya nʼime ya.