Mkpughe 5

Akwara m akwa nʼobi ilu nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla a hụrụ tozuru oke ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ileba anya nʼime ya.

Revelation 5:4 (UKJV) And I wept much, because no man was found worthy to open and to read the book, neither to look thereon.

2Ahụkwara m otu mmụọ ozi dị ukwuu, ka ọ na-ekwusa okwu nʼoke olu na-asị, “Ọ bụ onye kwesiri ịnyakapụ akara ndị a ma saghee akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ?”

3Ma ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ilenye ya anya a hụrụ nʼeluigwe, maọbụ nʼụwa, maọbụ nʼokpuru ụwa.

4Akwara m akwa nʼobi ilu nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla a hụrụ tozuru oke ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ileba anya nʼime ya.

5Mgbe ahụ, otu onye nʼime ndị okenye ahụ gwara m sị, “Akwala akwa. Lee, Ọdụm ebo Juda, bụ mgbọrọgwụ Devid, emeriela. Ọ pụrụ ịnyakapụ akara asaa ahụ ma saghekwaa akwụkwọ ahụ.”

6Mgbe ahụ, ahụrụ m Nwa Atụrụ na-eguzo nʼetiti ocheeze ahụ dịka e gburu ya egbu. Anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gbara ya gburugburu. O nwekwara mpi asaa na anya asaa, nke bụ mmụọ asaa nke Chineke, ndị e zipụrụ nʼime ụwa niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.