Mkpughe 7

Ọ bụ nke a mere, “ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha.

Revelation 7:15 (UKJV) Therefore are they before the throne of God, and serve him day and night in his temple: and he that sits on the throne shall dwell among them.

13Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?”

14Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ.

15Ọ bụ nke a mere, “ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha.

16‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla. Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’ okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ.

17Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha; ‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’ ‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.