1Mgbe o meghere akara nke asaa, akụkụ niile nke eluigwe dara jụụ ruo ihe dị ka iri nkeji atọ.
2Ahụrụ m ndị mmụọ ozi asaa, ndị na-eguzo nʼihu Chineke. E nyere ha opi ike nʼotu nʼotu.
3Mmụọ ozi ọzọ nke ji ite igwe ntakịrị e ji ọlaedo kpụọ bịara guzo nʼihu ebe ịchụ aja. E nyere ya ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ ka o jiri chụọ aja, ya na ekpere ndị nsọ niile, nʼebe ịchụ aja e jiri ọlaedo wuo, nʼihu ocheeze ahụ.
4Anwụrụ ọkụ nke ihe ahụ na-esi isi ụtọ, ya na ekpere ndị nsọ sitere nʼaka mmụọ ozi ahụ rigoo elu nʼihu Chineke.