Mkpughe 8

Mmụọ ozi ọzọ nke ji ite igwe ntakịrị e ji ọlaedo kpụọ bịara guzo nʼihu ebe ịchụ aja. E nyere ya ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ ka o jiri chụọ aja, ya na ekpere ndị nsọ niile, nʼebe ịchụ aja e jiri ọlaedo wuo, nʼihu ocheeze ahụ.

Revelation 8:3 (UKJV) And another angel came and stood at the altar, having a golden censer; and there was given unto him much incense, that he should offer it with the prayers of all saints upon the golden altar which was before the throne.

1Mgbe o meghere akara nke asaa, akụkụ niile nke eluigwe dara jụụ ruo ihe dị ka iri nkeji atọ.

2Ahụrụ m ndị mmụọ ozi asaa, ndị na-eguzo nʼihu Chineke. E nyere ha opi ike nʼotu nʼotu.

3Mmụọ ozi ọzọ nke ji ite igwe ntakịrị e ji ọlaedo kpụọ bịara guzo nʼihu ebe ịchụ aja. E nyere ya ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ ka o jiri chụọ aja, ya na ekpere ndị nsọ niile, nʼebe ịchụ aja e jiri ọlaedo wuo, nʼihu ocheeze ahụ.

4Anwụrụ ọkụ nke ihe ahụ na-esi isi ụtọ, ya na ekpere ndị nsọ sitere nʼaka mmụọ ozi ahụ rigoo elu nʼihu Chineke.

5Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi ahụ weere ọkụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ tinye ya nʼime ite igwe ntakịrị ahụ, tụda ya, ka ọ danye nʼime ụwa. Mgbe o mere nke a, ụzụ egbe eluigwe dara, amụma gbukwara nʼụzọ dị oke egwu. Ala ọma jijiji dakwasịkwara ebe niile nʼụwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.