8Agịrị isi ha dịka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze ha dịkwa ka eze ọdụm.
9Ha yikwasịrị onwe ha ihe ikpuchi obi dịka nke e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka ụda nzọ ụkwụ ọtụtụ ịnyịnya nke ụgbọ agha na-esekpu na-abanye nʼọgbọ agha.
10Ha nwere ọdụdụ dịka akpị. Ma ike niile e nyere ha bụ imerụ ndị mmadụ ahụ ọnwa ise site nʼike dị nʼọdụdụ ha.
11Ha nwere mmụọ ozi nke Abis, onye na-achịkọta ha dịka eze. Aha ya nʼasụsụ Hibru bụ Abadọn, ma nʼasụsụ Griik ọ bụ Apolion.
12Ahụhụ nke mbụ agafeela, ebe ahụhụ abụọ ọzọ na-abịa nʼihu.