10Ha nwere ọdụdụ dịka akpị. Ma ike niile e nyere ha bụ imerụ ndị mmadụ ahụ ọnwa ise site nʼike dị nʼọdụdụ ha.
11Ha nwere mmụọ ozi nke Abis, onye na-achịkọta ha dịka eze. Aha ya nʼasụsụ Hibru bụ Abadọn, ma nʼasụsụ Griik ọ bụ Apolion.
12Ahụhụ nke mbụ agafeela, ebe ahụhụ abụọ ọzọ na-abịa nʼihu.
13Mgbe mmụọ ozi nke isii fụrụ opi ike ya, anụrụ m olu sitere na mpi anọ ahụ dị nʼebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo wuo, nke dị nʼihu ocheeze Chineke,
14na-agwa mmụọ ozi nke isii ahụ, nke ji opi ike okwu, “Tọpụ mmụọ ozi anọ ndị ahụ e kere agbụ nʼebe osimiri Yufretis dị.”