Mkpughe 9

Mgbe mmụọ ozi nke isii fụrụ opi ike ya, anụrụ m olu sitere na mpi anọ ahụ dị nʼebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo wuo, nke dị nʼihu ocheeze Chineke,

Revelation 9:13 (UKJV) And the sixth angel sounded, and I heard a voice from the four horns of the golden altar which is before God,

11Ha nwere mmụọ ozi nke Abis, onye na-achịkọta ha dịka eze. Aha ya nʼasụsụ Hibru bụ Abadọn, ma nʼasụsụ Griik ọ bụ Apolion.

12Ahụhụ nke mbụ agafeela, ebe ahụhụ abụọ ọzọ na-abịa nʼihu.

13Mgbe mmụọ ozi nke isii fụrụ opi ike ya, anụrụ m olu sitere na mpi anọ ahụ dị nʼebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo wuo, nke dị nʼihu ocheeze Chineke,

14na-agwa mmụọ ozi nke isii ahụ, nke ji opi ike okwu, “Tọpụ mmụọ ozi anọ ndị ahụ e kere agbụ nʼebe osimiri Yufretis dị.”

15A tọhapụrụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ, ndị e jibu eji na njikere maka oge awa ahụ, na ụbọchị ahụ, na ọnwa ahụ, na afọ ahụ, iji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.