19Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị, “Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu; aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.”
20Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị, “Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m, ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.”
21O kwuru banyere ndị Izrel, “Agbasara m aka m ogologo ụbọchị niile nye ndị nnupu isi na ndị na-ekwesị olu ike.”