Ndị Rom 11

Mgbe ahụ a na m ajụ, ọ ga-abụ na Chineke ajụla ndị ya? Mba, nke a apụghị ime, nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye Izrel. Abụ m nwa nwa Ebraham, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta.

Romans 11:1 (UKJV) I say then, Has God cast away his people? God forbid. For I also am an Israelite, of the seed of Abraham, of the tribe of Benjamin.

1Mgbe ahụ a na m ajụ, ọ ga-abụ na Chineke ajụla ndị ya? Mba, nke a apụghị ime, nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye Izrel. Abụ m nwa nwa Ebraham, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta.

2Chineke ajụbeghị ndị ya bụ ndị ọ họpụtara site na mmalite ihe niile. Ọ bụ na unu amaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere Ịlaịja, otu o siri rịọ Chineke arịrịọ megide ụmụ Izrel?

3“Onyenwe m, ha egbuchala ndị amụma gị niile, mebisiekwa ebe ịchụ aja gị niile, maọbụ naanị m fọdụrụ. Ha na-achọkwa ụzọ igbu m.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.