11Ajụjụ ọzọ m na-ajụ bụ nke a: Ọ ga-abụ na ha sụrụ ngọngọ ka ha daa ma ghara ibilite ọzọ? Ọ bụghị otu a! Kama nʼihi mmehie ha, nzọpụta rutere ndị mba ọzọ ka e sitekwa na nke a kpalie ekworo nʼime ụmụ Izrel.
12Ma ọ bụrụ na mmehie ha wetara akụnụba nye ụwa, ọ bụrụkwa na ịbụ ogbenye ha wetara ngọzị nye ndị mba ọzọ, ọ bụ na ngọzị babigara ụba oke agaghị adị mgbe a ga-agụkọta ọnụọgụgụ ha niile?
13Ugbu a, unu ndị mba ọzọ, ka m na-agwa okwu. Ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ onyeozi nye ndị mba ọzọ, ana m enwe afọ ojuju nʼihi ije ozi m.
14Nʼihi na enwere m olileanya na, ma eleghị anya, apụrụ m isite nʼụzọ a kpasuo ekworo nʼime ụfọdụ ụmụnna m, ka e site nʼekworo ha zọpụta ụfọdụ nʼime ha.
15Ọ bụrụ na ọ bụ site nʼọjụjụ a jụrụ ha ka e siri mee ka ụwa dịrị na mma, gịnị ga-eme mgbe a nabatara ha? Ọ ga-adị ka i si nʼọnwụ bilie ọzọ, nwee ndụ ọzọ.