13Ugbu a, unu ndị mba ọzọ, ka m na-agwa okwu. Ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ onyeozi nye ndị mba ọzọ, ana m enwe afọ ojuju nʼihi ije ozi m.
14Nʼihi na enwere m olileanya na, ma eleghị anya, apụrụ m isite nʼụzọ a kpasuo ekworo nʼime ụfọdụ ụmụnna m, ka e site nʼekworo ha zọpụta ụfọdụ nʼime ha.
15Ọ bụrụ na ọ bụ site nʼọjụjụ a jụrụ ha ka e siri mee ka ụwa dịrị na mma, gịnị ga-eme mgbe a nabatara ha? Ọ ga-adị ka i si nʼọnwụ bilie ọzọ, nwee ndụ ọzọ.
16Ebe ọ bụkwa na iberibe achịcha e jiri chụọ aja bụ ihe dị nsọ, mgbe ahụ, achịcha ahụ niile bụ ihe dị nsọ. Nʼihi na ọ bụrụ na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, otu a kwa, alaka ya ga-adịkwa nsọ.
17Ma a nyakapụrụ ụfọdụ alaka osisi a, werekwa unu bụ alaka osisi oliv ọhịa nyapagide nʼọnọdụ ha. Ya mere, unu esorola keta oke na ngọzị sitere na mgbọrọgwụ osisi oliv ahụ.