18Ma unu ekwesighị ịnya isi na a dọkapụrụ alaka ndị ọzọ were unu dochie nʼọnọdụ ha. Ihe unu na-aghaghị ịmata bụ nke a: unu bụ naanị alaka dị nʼosisi. Ọ bụghị unu na-ebu mgbọrọgwụ osisi, kama ọ bụ mgbọrọgwụ osisi na-ebu unu.
19Ma eleghị anya unu nwere ike kwuo, “Ma a nyakapụrụ alaka ụfọdụ e nwee ohere ebe a ga-anyapagide anyị.”
20Nke ahụ bụ eziokwu. Ma chetakwanụ na a nyakapụrụ ha nʼihi ekweghị ekwe ha, ma unu nọ naanị site nʼokwukwe. Ya mere anyala isi, kama na-atụ egwu.
21Nʼihi na ọ bụrụ na Chineke emereghị alaka nke osisi ahụ wapụtara nʼonwe ya ebere, ọ gaghị emekwara gị ebere.
22Ya mere, tulee obiọma na aka ike Chineke, aka ike nʼebe ndị dara ada nọ, ma obiọma nʼebe unu nọ, naanị mgbe unu na-anọgideghị nʼobi ebere ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-anyakapụkwa unu.