Ndị Rom 12

Anyị nwere onyinye dị iche iche nke e sitere nʼamara nye anyị, ọ bụrụ na onye ọbụla nwere onyinye ibu amụma, ya buo ya dịka okwukwe o nwere ha.

Romans 12:6 (UKJV) Having then gifts differing according to the grace that is given to us, whether prophecy, let us prophesy according to the proportion of faith;

4Dịka anyị niile nʼotu nʼotu si nwe anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche,

5nʼotu aka ahụ, nʼime Kraịst anyị bụ otu, nʼagbanyeghị na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu anụ ahụ. E jikọtara anyị niile nʼotu nʼotu nye ibe anyị.

6Anyị nwere onyinye dị iche iche nke e sitere nʼamara nye anyị, ọ bụrụ na onye ọbụla nwere onyinye ibu amụma, ya buo ya dịka okwukwe o nwere ha.

7Ọ bụrụ ije ozi, ya jee ozi, ya bụrụkwanụ izi ihe, ya zie ihe.

8Ka onye nwere onyinye ịgbaume, gbaa ndị ọzọ ume, ya bụrụkwanụ inyeaka, ka onye nwere onyinye a site nʼafọ ofufu mee ya, ọ bụrụ ịbụ onyendu, ka onye ahụ duo site nʼikpachapụ anya, ya bụrụkwanụ ime ebere, ka onye ahụ jiri obi ụtọ na-eme ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.