8Ọ bụrụ na anyị adịrị ndụ, anyị dị ndụ nye Onyenwe anyị; ọ bụrụkwa na anyị anwụọ, anyị nwụrụ nye Onyenwe anyị; ya mere ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Onyenwe anyị.
9Ọ bụ nʼihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, ma biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe nke ndị dị ndụ na nke ndị nwụrụ anwụ.
10Ma gị onwe gị, gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe? Gịnị mekwara i ji eleda ya anya? Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼotu nʼotu nʼihu oche ikpe Chineke.
11E dere ya, “ ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru, ‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m; ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ ”
12E, anyị niile nʼotu nʼotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nʼihu Chineke.