10Ma gị onwe gị, gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe? Gịnị mekwara i ji eleda ya anya? Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼotu nʼotu nʼihu oche ikpe Chineke.
11E dere ya, “ ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru, ‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m; ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ ”
12E, anyị niile nʼotu nʼotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nʼihu Chineke.
13Ya mere, ka anyị kwụsị ikperịta onwe anyị ikpe, kama kpebie nʼime obi gị na i gaghị edochiri nwanna gị ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ maọbụ ihe mgbochi nʼụzọ.
14Dịka onye nọ nʼime Onyenwe anyị Jisọs, o doro m anya nke ọma na o nweghị ihe ọbụla na-adịghị ọcha na nke onwe ya. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-ahụta ihe ọbụla dịka ihe na-adịghị ọcha, nye onye dị otu a, ihe ahụ adịghị ọcha.