8Ma ana m agwa unu na Kraịst aghọọla onye na-ejere ndị e biri ugwu ozi nʼihi eziokwu nke Chineke, iji mee ka nkwa e kwere ndị bụ nna nna anyị ochie guzozie.
9Ka ndị mba ọzọ nwe ike inye Chineke otuto maka ebere ya, dịka e dere ya, “Nʼihi nke a, aga m eto gị nʼetiti ndị mba ọzọ, aga m abụ abụ nye aha gị.”
10O kwukwara ọzọ sị, “Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.”
11Ọzọkwa, “Toonu Onyenwe anyị unu ndị mba ọzọ niile, ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.”
12Ọzọkwa, Aịzaya na-asị, “Mgbọrọgwụ Jesi ga-epulite ọzọ, onye nke ga-ebili ịchị mba niile, ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.”