7Nʼihi ya, nabatanụ onwe unu dị ka Kraịst nabatara unu, iji wetara Chineke otuto.
8Ma ana m agwa unu na Kraịst aghọọla onye na-ejere ndị e biri ugwu ozi nʼihi eziokwu nke Chineke, iji mee ka nkwa e kwere ndị bụ nna nna anyị ochie guzozie.
9Ka ndị mba ọzọ nwe ike inye Chineke otuto maka ebere ya, dịka e dere ya, “Nʼihi nke a, aga m eto gị nʼetiti ndị mba ọzọ, aga m abụ abụ nye aha gị.”
10O kwukwara ọzọ sị, “Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.”
11Ọzọkwa, “Toonu Onyenwe anyị unu ndị mba ọzọ niile, ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.”