10O kwukwara ọzọ sị, “Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.”
11Ọzọkwa, “Toonu Onyenwe anyị unu ndị mba ọzọ niile, ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.”
12Ọzọkwa, Aịzaya na-asị, “Mgbọrọgwụ Jesi ga-epulite ọzọ, onye nke ga-ebili ịchị mba niile, ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.”
13Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ.
14Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe.