12Ọzọkwa, Aịzaya na-asị, “Mgbọrọgwụ Jesi ga-epulite ọzọ, onye nke ga-ebili ịchị mba niile, ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.”
13Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ.
14Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe.
15Ma otu ọ dị, edepụtala m ụfọdụ isi okwu nʼebe o doro anya nye unu, iji chetara unu ha ọzọ, nʼihi amara Chineke nyere m,
16abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ.