Ndị Rom 15

abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ.

Romans 15:16 (UKJV) That I should be the minister of Jesus Christ to the Gentiles, ministering the gospel of God, that the offering up of the Gentiles might be acceptable, being sanctified by the Holy Spirit.

14Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe.

15Ma otu ọ dị, edepụtala m ụfọdụ isi okwu nʼebe o doro anya nye unu, iji chetara unu ha ọzọ, nʼihi amara Chineke nyere m,

16abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ.

17Nʼihi ya, ana m anya isi nʼime Kraịst Jisọs banyere ọrụ m na-arụrụ Chineke.

18Agaghị m anwa anwa kwuo okwu banyere ihe ọzọ karịakwa ihe ndị ahụ Kraịst rụpụtara site nʼaka m, bụ idubata ndị mba ọzọ, ime ka ha rube isi nye Chineke, site nʼokwu ọnụ m na ihe m rụrụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.