2Biko nabatanụ ya nʼime Onyenwe anyị dịka o kwesiri ndị ya. Nyekwaranụ ya aka nʼụzọ niile unu nwere ike, nʼihi na o nyerela mụ na ọtụtụ ndị ọzọ aka.
3Keleerenụ m Prisila na Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ Kraịst Jisọs.
4Ndị a atụghị egwu ọnwụ nʼihi ndụ m. Ọ bụghị naanị mụ onwe m na ekele ha, kama nzukọ Kraịst ndị dị na mba ọzọ niile na-ekelekwa ha.
5Biko kelekwaaranụ m ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ha. Keleerenụ m ezi enyi m Epinetus. Nwoke a bụ onye buru ụzọ nabata Kraịst nʼobi ya, nʼakụkụ Eshịa niile.
6Keleerenụ m Meri, onye rụsịrị ọrụ ike nʼetiti unu.