4Ndị a atụghị egwu ọnwụ nʼihi ndụ m. Ọ bụghị naanị mụ onwe m na ekele ha, kama nzukọ Kraịst ndị dị na mba ọzọ niile na-ekelekwa ha.
5Biko kelekwaaranụ m ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ha. Keleerenụ m ezi enyi m Epinetus. Nwoke a bụ onye buru ụzọ nabata Kraịst nʼobi ya, nʼakụkụ Eshịa niile.
6Keleerenụ m Meri, onye rụsịrị ọrụ ike nʼetiti unu.
7Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nʼụlọ mkpọrọ. Ndị ozi niile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst.
8Kelekwaaranụ m Ampliatọs onye m hụrụ nʼanya nʼime Onyenwe anyị.