6Keleerenụ m Meri, onye rụsịrị ọrụ ike nʼetiti unu.
7Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nʼụlọ mkpọrọ. Ndị ozi niile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst.
8Kelekwaaranụ m Ampliatọs onye m hụrụ nʼanya nʼime Onyenwe anyị.
9Keleenụ Ọbanọs, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ Kraịst, na Stakis ezi enyi m.
10Otu a kwa, keleenụ Apelis onye anwapụtarala nguzosike ya nʼime Kraịst. Keleenụ ndị ezinaụlọ Aristobulọs.