11Nʼihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nʼihu.
12Ndị niile mehiere nʼọnọdụ enweghị iwu ga-ala nʼiyi nʼọnọdụ enweghị iwu. Ma ndị niile mehiere megide iwu ahụ ha mara ihe banyere ya ka a ga-ama ikpe dịka iwu siri kwuo.
13Nʼihi na ọ bụghị ndị ahụ na-anụ mgbe a na-agụpụta akwụkwọ iwu ka a na-agụ dịka ndị ezi omume nʼihu Chineke, kama ọ bụ ndị ahụ niile na-eme ihe iwu kwuru ka a ga-agụ ka ndị ezi omume.
14Nʼezie, mgbe ndị mba ọzọ bụ ndị na-enweghị iwu sitere nʼobi ha mee ihe iwu kwuru, o gosiri na ha bụ iwu nye onwe ha, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu ahụ e dere ede.
15Ha na-egosipụta na edeela ihe ndị ahụ iwu kwuru nʼobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ụfọdụ, ma na-agọpụrụ ha mgbe ụfọdụ.