13Nʼihi na ọ bụghị ndị ahụ na-anụ mgbe a na-agụpụta akwụkwọ iwu ka a na-agụ dịka ndị ezi omume nʼihu Chineke, kama ọ bụ ndị ahụ niile na-eme ihe iwu kwuru ka a ga-agụ ka ndị ezi omume.
14Nʼezie, mgbe ndị mba ọzọ bụ ndị na-enweghị iwu sitere nʼobi ha mee ihe iwu kwuru, o gosiri na ha bụ iwu nye onwe ha, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu ahụ e dere ede.
15Ha na-egosipụta na edeela ihe ndị ahụ iwu kwuru nʼobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ụfọdụ, ma na-agọpụrụ ha mgbe ụfọdụ.
16Dịka oziọma ahụ m na-ekwusa si kwuo, Chineke ga-ekpe ndụ nzuzo niile ụmụ mmadụ na-ebi ikpe, site na Kraịst Jisọs.
17Ma ugbu a, gị onye na-akpọ onwe gị onye Juu, onye tụkwasịrị obi gị nʼiwu ahụ, onye na-anyakwa isi na ị maara Chineke,