15Ụkwụ ha na-eme ọsịịsọ ịkwafu ọbara.
16Mbibi na nhụju anya dị nʼụzọ ha niile.
17Ha amaghị ihe bụ ụzọ udo.
18Ha amatabeghị ihe ịtụ egwu Chineke pụtara.”
19Ugbu a, anyị maara na ihe ọbụla iwu kwuru, ọ bụ ndị nọ nʼokpuru iwu ka ọ dịịrị, ka esite otu a kpuchite ọnụ niile nʼotu nʼotu. Ma meekwa ka ụwa niile mata na ha bụ ndị ikpe mara nʼebe Chineke nọ.