Ndị Rom 3

Ha amatabeghị ihe ịtụ egwu Chineke pụtara.”

Romans 3:18 (UKJV) There is no fear of God before their eyes.

16Mbibi na nhụju anya dị nʼụzọ ha niile.

17Ha amaghị ihe bụ ụzọ udo.

18Ha amatabeghị ihe ịtụ egwu Chineke pụtara.”

19Ugbu a, anyị maara na ihe ọbụla iwu kwuru, ọ bụ ndị nọ nʼokpuru iwu ka ọ dịịrị, ka esite otu a kpuchite ọnụ niile nʼotu nʼotu. Ma meekwa ka ụwa niile mata na ha bụ ndị ikpe mara nʼebe Chineke nọ.

20Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke maka na ọ na-edebe iwu. Kama, ọ bụ site nʼiwu ka anyị ji mata ihe banyere mmehie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.