Ndị Rom 3

Otu onye nwere ike ị sị, “na ọ bụrụ na a na-esite nʼokwu ụgha m, mee ka eziokwu nke Chineke pụta ìhè karịa, na-ewetara Chineke otuto, gịnị mere e ji ama m ikpe dịka onye mmehie?”

Romans 3:7 (UKJV) For if the truth of God has more abounded through my lie unto his glory; why yet am I also judged as a sinner?

5Ma ọ bụrụ na ajọ omume anyị na-eme ka ezi omume Chineke pụta ìhè, gịnị ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na Chineke adịghị eme ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na ọ taa anyị ahụhụ nʼihi ajọ omume anyị? (Ana m ekwu okwu a dị ka ndị mmadụ.)

6Nʼezie, ọ bụghị otu a, ọ bụrụ na ọ bụ otu a, oleekwanụ otu Chineke ga-esi kpee ụwa ikpe?

7Otu onye nwere ike ị sị, “na ọ bụrụ na a na-esite nʼokwu ụgha m, mee ka eziokwu nke Chineke pụta ìhè karịa, na-ewetara Chineke otuto, gịnị mere e ji ama m ikpe dịka onye mmehie?”

8Ọ pụtara na anyị ga-asị, “ka anyị na-eme ihe ọjọọ ka ezi ihe si na ya pụta”? Ụfọdụ ndị mmadụ ji nkwutọ na-ebo m ebubo na m na-akụzi ihe dị otu a, ikpe a mara ha kwesiri ekwesi.

9Gịnị kwanụ? Anyị ọ ka ha mma? Mba, ma e meela ya rịị ka ọ pụta ìhè na mmadụ niile nọ nʼokpuru mmehie, ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.