7Otu onye nwere ike ị sị, “na ọ bụrụ na a na-esite nʼokwu ụgha m, mee ka eziokwu nke Chineke pụta ìhè karịa, na-ewetara Chineke otuto, gịnị mere e ji ama m ikpe dịka onye mmehie?”
8Ọ pụtara na anyị ga-asị, “ka anyị na-eme ihe ọjọọ ka ezi ihe si na ya pụta”? Ụfọdụ ndị mmadụ ji nkwutọ na-ebo m ebubo na m na-akụzi ihe dị otu a, ikpe a mara ha kwesiri ekwesi.
9Gịnị kwanụ? Anyị ọ ka ha mma? Mba, ma e meela ya rịị ka ọ pụta ìhè na mmadụ niile nọ nʼokpuru mmehie, ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ.
10Dịka e dere ya, “Ọ dịghị onye ọbụla bụ onye ezi omume, ọ dịghị ọ bụladị otu onye.
11Ọ dịghị onye ọbụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ ịchọ Chineke.