18Mgbe Naomi hụrụ na Rut ekpebiela nʼime onwe ya iso ya, ọ kwụsịrị ịgwa ya okwu ọzọ.
19Ya mere, ha abụọ gagidere ije rute Betlehem. Mgbe ha batara Betlehem, obodo ahụ mere mkpọtụ, nʼihi nlọta ha. Ndị inyom jụrụ sị, “Ọ bụ Naomi bụ nke a nʼezie?”
20Ma Naomi zara ha sị, “Unu akpọkwala m Naomi, kama kpọọnụ m Mara, nʼihi na Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka ndụ m jupụta nʼihe ilu.
21Aka m juru eju mgbe m si nʼebe a pụọ, ma Onyenwe anyị emeela ka m gbara aka lọta. Gịnị mere unu ji akpọ m Naomi ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbakụtara m azụ, ebe ọ bụ na Onye pụrụ ime ihe niile mere ka nsogbu dakwasị m.”
22Otu a ka Naomi na Rut onye Moab bụ nwunye nwa ya si laghachi nʼala Juda. Oge ha ji lọbata nʼobodo Betlehem bụ oge a na-amalite ịghọ ọka balị.