15Mgbe o biliri ịchịkọtakwa ọka, Boaz nyere ụmụ okorobịa ya iwu, “Hapụnụ ya ka ọ chịkọta ọka ọ bụladị nʼetiti ukwu ọka ndị guzo eguzo, unu agwala ya okwu ihere ọbụla.
16Unu sitekwa nʼukwu ọka mịpụtara ya ụfọdụ tụsara ya nʼala ka ọ tụtụrụ. Unu abarala ya mba.”
17Ya mere, Rut tụtụrụ ọka nʼubi ahụ ruo oge anyasị. Mgbe ọ fuchasịrị ọka balị niile ọ tụtụtara, o nwetara ihe nwere ike iru otu bushel.
18O buuru ya baa nʼime obodo, bunye ya nne di ya, nyekwa ya nri o rifọrọ mgbe o rijuchara afọ.
19Nne di ya jụrụ ya, “Ebee ka ị tụtụrụ ọka taa? Ebee ka ị rụrụ ọrụ? Ka nwoke ahụ hụtara gị bụrụ onye a gọziri agọzi.” Rut kọọrọ nne di ya banyere onye ahụ ọ rụrụ ọrụ na nke ya. Ọ sịrị, “Aha nwoke mụ na ya rụrụ ọrụ bụ Boaz.”