Rut 2

O buuru ya baa nʼime obodo, bunye ya nne di ya, nyekwa ya nri o rifọrọ mgbe o rijuchara afọ.

Ruth 2:18 (UKJV) And she took it up, and went into the city: and her mother in law saw what she had gleaned: and she brought forth, and gave to her that she had reserved after she was sufficed.

16Unu sitekwa nʼukwu ọka mịpụtara ya ụfọdụ tụsara ya nʼala ka ọ tụtụrụ. Unu abarala ya mba.”

17Ya mere, Rut tụtụrụ ọka nʼubi ahụ ruo oge anyasị. Mgbe ọ fuchasịrị ọka balị niile ọ tụtụtara, o nwetara ihe nwere ike iru otu bushel.

18O buuru ya baa nʼime obodo, bunye ya nne di ya, nyekwa ya nri o rifọrọ mgbe o rijuchara afọ.

19Nne di ya jụrụ ya, “Ebee ka ị tụtụrụ ọka taa? Ebee ka ị rụrụ ọrụ? Ka nwoke ahụ hụtara gị bụrụ onye a gọziri agọzi.” Rut kọọrọ nne di ya banyere onye ahụ ọ rụrụ ọrụ na nke ya. Ọ sịrị, “Aha nwoke mụ na ya rụrụ ọrụ bụ Boaz.”

20Mgbe ahụ Naomi zara nwunye nwa ya sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri ka ọ bụ, onye na-ahapụbeghị igosi ebere ya nye ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Nwoke a bụ otu nʼime ndị agbụrụ anyị, otu onye nʼime ndị onye mgbapụta anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.