3Ugbu a, gaa saa ahụ gị, teekwa mmanụ isi ụtọ, yirikwa uwe mara mma. I mesịa, gaa nʼebe ịzọcha ọka, ma ekwekwala ka ọ hụ gị, tutu ruo mgbe o risiri nri ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ.
4Leziekwa anya chọpụta ebe ọ ga-edina rahụ ụra. Mgbe ị maara na ọ rahụla ụra nke ọma, gaa kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya, dinaakwa ala nʼebe ahụ. Ọ ga-agwa gị ihe ị ga-eme.”
5Rut zara sị, “Aga m eme ihe ọbụla ị sị m mee.”
6Ya mere, Rut pụrụ nʼabalị ahụ gaa nʼebe ịzọcha ọka ahụ, meekwa dịka nne di ya gwara ya.
7Mgbe Boaz risiri nri ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mmụọ ya dịkwa mma, ọ gara ka ọ dinaa ala na nsọtụ ebe atụkọtara akpa ọka. Rut jiri nwayọọ gaa nʼebe ahụ, kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ, dina nʼakụkụ ụkwụ ya.