5Rut zara sị, “Aga m eme ihe ọbụla ị sị m mee.”
6Ya mere, Rut pụrụ nʼabalị ahụ gaa nʼebe ịzọcha ọka ahụ, meekwa dịka nne di ya gwara ya.
7Mgbe Boaz risiri nri ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mmụọ ya dịkwa mma, ọ gara ka ọ dinaa ala na nsọtụ ebe atụkọtara akpa ọka. Rut jiri nwayọọ gaa nʼebe ahụ, kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ, dina nʼakụkụ ụkwụ ya.
8Nʼetiti abalị Boaz kụjara teta na mberede, tụgharịa, ma lee o nwere nwanyị dina nʼala ala ụkwụ ya.
9Ọ jụrụ ya sị, “Ị bụ onye?” Rut zara ya sị, “Abụ m Rut, ohu gị nwanyị, onyenwe m. Were ọnụ ọnụ akwa gị kpukwasị m, nʼihi na ị bụ onye agbụrụ mgbapụta m dị nso.”