Rut 4

Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, Onyenwe anyị nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke.

Ruth 4:13 (UKJV) So Boaz took Ruth, and she was his wife: and when he went in unto her, the LORD gave her conception, and she bare a son.

11Mgbe ahụ, ndị okenye na ndị niile nọ nʼọnụ ụzọ ama kwuru sị, “Anyị bụ ndị akaebe. Ka Onyenwe anyị mee nwanyị a na-abata nʼezinaụlọ gị ka ọ dịrị ka Rechel na Lịa, ndị ebo Izrel niile sitere na ha pụta! Ka ị bụrụkwa ọgaranya nʼagbụrụ Efrata, ghọọkwa onye a ma ama na Betlehem.

12Site nʼụmụ Onyenwe anyị ga-enye gị site na nwanyị a, ka ezinaụlọ gị dịrị ka nke Perez onye Tama mụụrụ Juda.”

13Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, Onyenwe anyị nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke.

14Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile.

15Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.