Rut 4

Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile.

Ruth 4:14 (UKJV) And the women said unto Naomi, Blessed be the LORD, which has not left you this day without a kinsman, that his name may be famous in Israel.

12Site nʼụmụ Onyenwe anyị ga-enye gị site na nwanyị a, ka ezinaụlọ gị dịrị ka nke Perez onye Tama mụụrụ Juda.”

13Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, Onyenwe anyị nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke.

14Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile.

15Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke.”

16Naomi kuuru nwantakịrị ahụ, jikụọ ya nʼapata ya, lekọtaa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.