8Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma, soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.
9Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero.
10Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma, olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma.
11Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo, nke e ji ọlaọcha chọọ mma.
12Mgbe eze nọ na tebul ya, mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile.