10Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma, olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma.
11Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo, nke e ji ọlaọcha chọọ mma.
12Mgbe eze nọ na tebul ya, mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile.
13Onye m hụrụ dị m ka ụda máá e kechiri nʼakpa nke dị nʼetiti ara m abụọ.
14Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.