9I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m; i riela m obi, i werela ile anya gị na ihe olu i yi rie obi m.
10Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Lee ka ịhụnanya gị si dị mma nke ukwuu karịa mmanya, isisi ụtọ nke mmanụ otite gị na-esi isi ọma karịa mmanụ ụda ọbụla.
11Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m, mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị, isisi ụtọ nke uwe gị na-esi ka Lebanọn
12Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ. Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa.
13Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa, nke nwere henna na naad,