11Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m, mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị, isisi ụtọ nke uwe gị na-esi ka Lebanọn
12Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ. Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa.
13Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa, nke nwere henna na naad,
14naad na safron, kalamus na sinamọn, na osisi nke ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda máá, na aloos na ụda kachasị mma dị iche iche na-esi isi ụtọ.
15I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige, olulu mmiri dị ndụ nke si na Lebanọn asọdata.