2A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya. Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ. “Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya, nduru m, onye na-enweghị ntụpọ. Igirigi ezokwasịla m nʼisi, agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.”
3Eyipụlarị m uwe m. Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ? Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ?
4Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ, mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike.
5Mụ onwe m biliri imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma aka m abụọ jupụtakwara na mmanụ máá, mmanụ máá si na mkpịsịaka m niile na-atapụsi, nʼelu ihe mkpọchi nke ibo.
6Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala. Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara. Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla. Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị.