Abụ nke Abụ 7

Abụ m nke onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa m ka ọ chọrọ.

Song of Solomon 7:10 (UKJV) I am my beloved's, and his desire is toward me.

8Ekwuru m sị, “Aga m arịgoro elu osisi nkwụ ahụ, jidekwa mkpụrụ ya aka.” Ugbu a, ka ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ vaịnị, ka isisi nke iku ume gị dịkwa ka mkpụrụ osisi apụl,

9ka okpo ọnụ gị dịka mmanya makarịsịrị na mma. Ka mmanya ahụ gbadaa nwayọọ nye onye m hụrụ nʼanya, na-asọda nwayọọ nʼelu egbugbere ọnụ ya na eze ya.

10Abụ m nke onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa m ka ọ chọrọ.

11Bịa, onye m hụrụ nʼanya, ka anyị gaa nʼime obodo, ka anyị nọọ ọnọdụ abalị nʼobodo nta.

12Ka anyị bilie ngwangwa nʼisi ụtụtụ pụọ jee nʼubi lee ma osisi vaịnị ha amaala ifuru, ma okoko ya agbawaala, ma osisi pomegranet agbawaala okoko. Nʼebe ahụ ka m ga-egosi gị ịhụnanya m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.