Abụ nke Abụ 7

Bịa, onye m hụrụ nʼanya, ka anyị gaa nʼime obodo, ka anyị nọọ ọnọdụ abalị nʼobodo nta.

Song of Solomon 7:11 (UKJV) Come, my beloved, let us go forth into the field; let us lodge in the villages.

9ka okpo ọnụ gị dịka mmanya makarịsịrị na mma. Ka mmanya ahụ gbadaa nwayọọ nye onye m hụrụ nʼanya, na-asọda nwayọọ nʼelu egbugbere ọnụ ya na eze ya.

10Abụ m nke onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa m ka ọ chọrọ.

11Bịa, onye m hụrụ nʼanya, ka anyị gaa nʼime obodo, ka anyị nọọ ọnọdụ abalị nʼobodo nta.

12Ka anyị bilie ngwangwa nʼisi ụtụtụ pụọ jee nʼubi lee ma osisi vaịnị ha amaala ifuru, ma okoko ya agbawaala, ma osisi pomegranet agbawaala okoko. Nʼebe ahụ ka m ga-egosi gị ịhụnanya m.

13Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nụ isi nke mandreki na-ewepụta; mkpụrụ osisi niile na-atọ ụtọ ga-adịkwa nʼọnụ ụzọ anyị, ma ndị ọhụrụ ma ndị ochie, nʼihi na edokọtaala m ha maka onye m hụrụ nʼanya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.