Zekaraya 10

A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ, a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu, a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha, sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche.

Zechariah 10:4 (UKJV) Out of him came forth the corner, out of him the nail, out of him the battle bow, out of him every oppressor together.

2Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ, ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha, ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha, okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye. Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụ a na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ.

3“Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ, aga m atakwa ndị ndu niile ahụhụ; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda, ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha.

4A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ, a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu, a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha, sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche.

5Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha, ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile. Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha, ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya.

6“Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike, zọpụtakwa ụlọ Josef. Aga m eme ka ha lọghachita, nʼihi na aga m egosi ha obi ebere. Ha ga-adị ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha, aga m azakwa arịrịọ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.