1Rịọọnụ Onyenwe anyị mmiri ozuzo nʼoge mmiri ozuzo nke ikpeazụ, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-ezite oke amụma mmiri. Ọ bụ ya na-enye ụmụ mmadụ mmiri ozuzo, na-enyekwa mmadụ niile ihe ọkụkụ nke ubi.
2Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ, ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha, ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha, okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye. Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụ a na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ.
3“Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ, aga m atakwa ndị ndu niile ahụhụ; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda, ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha.
4A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ, a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu, a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha, sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche.