1Meghee ọnụ ụzọ gị niile, gị Lebanọn. Ka ọkụ repịa osisi sida gị niile.
2Kwasie akwa ike, gị osisi junipa, nʼihi na osisi sida adaala, nʼihi na e mebiela osisi ukwu ndị niile ahụ mabigara mma oke. Kwasienụ akwa ike, unu osisi ook nke Bashan, nʼihi na e gbudachala oke ọhịa ahụ!
3Gee ntị nʼụzụ akwa nke ndị ọzụzụ atụrụ, e mebiela ebe ịta nri mara mma nke anụ ụlọ ha. Gee ntị ka unu nụrụ olu mbigbọ nke ụmụ ọdụm, nʼihi na e bibiela oke ọhịa nke Jọdan.